Abụ Ọma

Chapter 23

1 Onyenwe anyị na-azụ m dịka atụrụ, ọ dịghị ihe akọrọ m.

2 Ọ na-eme ka m dinaa ala nʼebe ahịhịa ndụ na-eto, ọ na-edugharị m nʼakụkụ mmiri dị jụụ,

3 ọ na-atụte mkpụrụobi m. Ọ na-edu m nʼụzọ niile nke ezi omume nʼihi aha ya.

4 A sịkwarị na m na-aga ije, na ndagwurugwu nke ọchịchịrị ọnwụ, agaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla; nʼihi na ị nọnyeere m, mkpọrọ gị na mkpanaka gị na-akasị m obi.

5 Ị na-akwado tebul nʼihu m, nʼanya ndị iro m. I tere isi m mmanụ Ndị ọzụzụ atụrụ na-ejikwa ya achụ ụmụ ahụhụ na ndanda na-achọ ịrịbanye atụrụ ndị ha na-azụ nʼimi. iko m na-ejubiga oke.

6 Nʼezie, ịdị mma na ebere ga-agbaso m ogologo ụbọchị niile nke ndụ m, m ga-ebikwa nʼụlọ Onyenwe anyị mgbe niile ebighị ebi.