Job

Chapter 16

1 Mgbe ahụ, Job zara sị:

2 "Anụla m ọtụtụ ihe dịka ndị a; ndị nkasiobi na-eweta ọnọdụ ọjọọ ka unu niile bụ.

3 Ogologo okwu efu ndị a niile unu na-ekwu, ọ naghị akwụsị? Gịnị bụ nsogbu unu nke mere unu ji aga nʼihu na-arụ ụka niile ndị a?

4 Mụ onwe m nwekwara ike ikwu okwu dịka unu, ma ọ bụrụ na unu nọ nʼọnọdụ m; enwere m ike kwuo okwu dị ụtọ na ntị megide unu, ma fufekwaa isi m megide unu.

5 Ma ọnụ m ga-agba unu ume; nkasiobi si nʼegbugbere ọnụ m ga-emekwa ka ihe mgbu unu dajụọ.

6 "Ma ọ bụrụ na m ekwuo, adịghị egbochi ihe mgbu m, ọ bụrụ na m ahapụ ikwu okwu, ọdịghị esi nʼahụ m pụọ?

7 Nʼezie o Chineke, i meela ka ike gwụ m, i tidakwala ezinaụlọ m.

8 I keela m agbụ; agbụ m abụrụla ihe akaebe megide m; ịta ahụ m ebiliela ịgba akaebe megide m.

9 Chineke na-eweso m iwe, jiri iwe ya na-adọwasị m, ọ na-atakwa ikikere eze ya megide m; onye iro m na-achịchapụrụ m anya ya.

10 Ụmụ mmadụ na-asaghe ọnụ ka ha chịa m ọchị, ha ji iti m aka nʼọnụ na-akwa m emo, jikọtakwa onwe ha megide m.

11 Chineke ewerela m nyefee nʼaka ndị ajọ omume, tụbakwa m nʼaka ndị na-emebi iwu.

12 Ihe na-agara m nke ọma, ma Chineke tipịara m. O jidere m nʼolu ma tiwasịa m. O meela m ihe ịgba ụta ya;

13 ndị ọgba ụta ya agbaala m gburugburu. Ọ na-agbawa akụrụ m na-enweghị ọmịiko mee ka oluilu m wụsịa nʼala.

14 Mgbe niile, ọ na-emegide m; ọ na-achụso m dịka dike nʼagha.

15 "Adụkọtala m akwa mkpe were ya kpuchie anụ ahụ m, liekwa ikuanya m nʼime ntụ.

16 Ihu m na-acha ọbara ọbara site nʼakwa nke m na-akwa, onyinyo nke ọnwụ dịkwa gburugburu egbugbere anya m abụọ;

17 ma aka m emeghị ihe ike ọbụla, ọzọ ekpere m dịkwa ọcha.

18 "Ala, biko, ezokwala ọbara m; mee ka akwa m ghara ịbụ ihe lara nʼiyi!

19 Ọ bụladị ugbu a, onye akaebe m nọ nʼeluigwe, onye nkwuchite ọnụ m nọ nʼebe dị elu.

20 Onye na-arịọrọ m arịrịọ bụ enyi m, dịka m na-awụsara Chineke anya mmiri m.

21 Nʼọnọdụ mmadụ ka ọ na-arịọ Chineke dịka mmadụ na-arịọ nʼihi enyi ya.

22 "Naanị afọ ole na ole ga-agabiga tupu m ga nʼụzọ nke nlọghachi m na-adịghị.