Chapter 5
1 "Jegharịa nʼokporoụzọ niile dị na Jerusalem, legharịa anya, ma mara, chọkwanụ gburugburu nʼama ya niile. Ma unu ọ ga-achọpụta otu onye, bụ onye na-eme ihe ziri ezi, na onye na-achọ eziokwu. M ga-agbagharakwa obodo a
2 Ọ bụ ezie, na ha na-asị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ,’ ma ha ka na-aṅụ iyi nʼokwu ụgha."
3 Onyenwe anyị , anya gị abụọ ọ bụghị eziokwu ka ọ na-achọ? Ị tiela ha ihe, ma o metụghị ha nʼahụ. I gwepịara ha, ma ha ekweghị a nabata ịdọ aka na ntị. Ha emeela ka ihu ha sie ike karịa nkume, ha ajụla ịchịgharị.
4 Mgbe ahụ, a sịrị, "Ndị a bụ naanị ndị ogbenye na ndị na-enweghị uche, ha amaghị ihe ọbụla gbasara ụzọ Onyenwe anyị , na iwu nke Chineke ha.
5 Aga m ejekwuru ndị ndu, gwa ha okwu sị, nʼezie ha maara ihe gbasara ụzọ Onyenwe anyị , marakwa iwu niile nke Chineke ha." Ma ha onwe ha nʼotu obi agbajiela ịyagba ahụ, tijiekwa agbụ niile.
6 Ya mere, aga m eme ka ọdụm si nʼoke ọhịa bịa lụso ha ọgụ; nkịta ọhịa bi nʼọzara ga-ebibi ha. Otu a kwa, agụ ga-abịa makpuru nso nso obodo ha ịdọkasị onye ọbụla si nʼime obodo ahụ na-apụta. Ihe ndị a ga-emezu nʼihi na nnupu isi ha adịla ukwuu, na nʼihi na ndaghachi azụ ha site na iso ụzọ m adịla ukwuu.
7 "Nʼihi gịnị ka m ga-eji gbaghara unu? Lee na ụmụ unu ahapụla m, na-agbaso, ma na-eji chi ndị na-abụghị chi na-aṅụ iyi. Ọ bụ m gbooro ha mkpa ha, ma ha nọgidere na-akwa iko. Ha jikwa ụlọ ndị akwụna mere ebe ha na-ezukọ.
8 Ha rijuru afọ, gbaa abụba dị ka oke ịnyịnya. Onye ọbụla nʼime ha kwa na-esigharị imi na-akpọku nwunye na-abụghị nke ya.
9 Ma Onyenwe anyị na-ajụ ajụjụ sị, m ga-ahapụ ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile? M ga-ahapụ ịbọtara mkpụrụobi m ọbọ megide mba dị otu a?"
10 "Baanụ nʼime ubi vaịnị ha a gbara ogige kposaa ihe dị nʼime ya, ma unu emebila ya kpamkpam. Gbajisienụ alaka ya nʼihi na o nweghị oge ndị a ji bụrụ ndị nke Onyenwe anyị .
11 Onyenwe anyị ekwuola ya sị, Lee, ụlọ Izrel na ụlọ Juda egosila na ha abụghị ndị e kwesiri ịtụkwasị obi." Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
12 Ha ekwuola okwu ụgha megide Onyenwe anyị . E, ha ekwuola sị, "O nweghị ihe Ọ ga-eme! Ihe ọjọọ ọbụla agaghị adakwasị anyị; mbibi nke ụnwụ na mma agha na-eweta agaghị erute anyị nso.
13 Ndị amụma ndị a niile dịka ikuku, nke okwu nwere isi na-adịghị nʼime ha. Ya mere, ka ihe ahụ niile ha buru nʼamụma bịakwasị ha."
14 Nʼihi ihe ndị a niile, ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, "Nʼihi na okwu ndị a esitela nʼọnụ ndị a pụta, aga m eme ka okwu m, nke si gị nʼọnụ na-apụta, ghọọ ọkụ. Aga m emekwa ka ndị a ghọọ nkụ ọkụ ahụ ga-erepịa.
15 Unu bụ ndị Izrel," otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, "Aga m eme ka otu mba si nʼebe dị anya bịa megide unu. Ọ bụ mba na-adị site na mgbe ochie, mba dị ike, nke unu na-adịghị anụ asụsụ ha, ndị unu na-adịghị aghọta okwu ha.
16 Akpa àkụ ha dịka ili ghere oghe; ha niile bụkwa ndị dike nʼagha.
17 Ha ga-eripịa ihe niile unu wetara nʼubi, ya na nri niile unu nwere. Ha ga-ebibi ụmụ unu ndị nwoke na ndị nwanyị. Ha ga-ebibi igwe ewu na atụrụ unu, na igwe ehi unu. Ha ga-ebibikwa osisi vaịnị na osisi fiig unu. Ọ bụ mma agha ha ka ha ga-eji bibie obodo unu niile e wusiri ike, bụ obodo ndị ahụ niile unu na-atụkwasị uche.
18 "Ma ọ bụladị na nʼụbọchị ndị ahụ," otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, "Agaghị m ebibicha unu kpamkpam.
19 Ọ ga-erukwa, mgbe ndị mmadụ ga-ajụ ajụjụ sị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị Chineke anyị ji mee anyị ihe dị otu a?’ Unu ga-agwa ha sị, ‘Dịka unu si gbakụta ya azụ malite ife chi ndị mba ọzọ nʼala nke aka unu, otu a ka unu ga-esi kpọọ isiala nye ndị mba ọzọ nʼala na-abụghị nke unu.’
20 "Kwupụta ihe a ka ụlọ Jekọb nụrụ ya, kwusaa ya na Juda.
21 Nụrụnụ ihe ndị a, unu ndị nzuzu na ndị na-enweghị uche, unu ndị nwere anya nke na-adịghị ahụ ụzọ, na unu ndị nwere ntị nke na-adịghị anụ ihe.
22 Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, na-ajụ sị, o kwesighị ka unu tụọ m egwu?" "O kwesighị ka unu maa jijiji nʼihu m? Emeela m ka uzuzu bụrụ oke osimiri nwere. Ọ bụkwa ụkpụrụ ebighị ebi nke ọ na-enweghị ike ịgafe. Ebili mmiri nwere ike magharịa, ma nke a apụghị ime ka osimiri si nʼọnọdụ ya wezuga onwe ya. Osimiri nwere ike bigbọọ, ma ọ pụghị ịgafe oke ahụ.
23 Ma ndị a nwere obi nke na-enupu isi, na obi nke na-adịghị ekwe ekwe. Ha atụgharịala wezuga onwe ha.
24 Ha adịghị asị onwe ha, ‘Ka anyị tụọ egwu Onyenwe anyị Chineke anyị, onye na-enye anyị mmiri ozuzo nʼoge ya, ọ bụkwa ya na-eme ka anyị na-ewebata ihe ubi anyị nʼoge ya.’
25 Ajọ omume unu emeela ka ihe ndị a hapụ irute unu aka. Mmehie unu anapụla unu ihe ọma gaara abụ nke unu.
26 "E nwere ndị ajọ mmadụ nʼetiti ndị m, ndị na-edo onwe ha dịka ndị mmadụ na-esiri nnụnụ ọnya, dịka ndị na-esi ọnya ka ha nwude mmadụ.
27 Dịka nkata a kpara nke nnụnụ jupụtara nʼime ya, ụlọ ndị dị otu a jupụtara nʼaghụghọ. Nʼihi nke a, ha ghọrọ ndị ọgaranya na ndị dị ike,
28 ha amaala abụba, anụ ahụ ha na-akwọkwa mụrụmụrụ. Ajọ ọrụ ha enweghị nsọtụ; ha adịghị achọkwa ikpe ziri ezi. Ha adịghị ekwuchite ọnụ onye na-enweghị nna; ha adịghị ekwuchitekwa ọnụ ndị ogbenye ime ka ha nweta ihe ruuru ha.
29 M ga-ahapụ ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile?" ka Onyenwe anyị kwupụtara, na-ajụ. "M ga-ahapụ ịbọrọ onwe m ọbọ megide mba dị otu a?
30 "Ihe ọjọọ nke jọbigara njọ oke emeela nʼala a.
31 Lee, ndị amụma na-ebu naanị amụma ụgha, ndị nchụaja na-achịkwa ndị m site nʼọchịchị nke nʼaka ike, ma lee, ndị m hụrụ ndụ dị otu a nʼanya. Gịnịkwa ka unu ga-eme nʼoge ikpeazụ."
