Abụ Ọma

Chapter 116

1 Ahụrụ m Onyenwe anyị nʼanya, nʼihi na ọ nụrụ olu m; ọ nụrụ mkpu akwa m maka ebere.

2 Nʼihi na o gere m ntị, aga m akpọku ya oge ndụ m niile.

3 Agbụ nke ọnwụ kekọrọ m, oke ihe mgbu nke ili bịakwasịrị m; nsogbu na iru ụjụ dakwasịrị m.

4 Mgbe ahụ, akpọkuru m aha Onyenwe anyị : "O Onyenwe anyị , zọpụta m!"

5 Onyenwe anyị bụ onye na-eme ebere na onye ezi omume. Chineke anyị jupụtakwara nʼọmịiko.

6 Onyenwe anyị na-echebe ndị na-enweghị uche; mgbe m nọ nʼọnọdụ mkpa, ọ zọpụtara m.

7 Laghachi azụ zuru ike, gị mkpụrụobi m, nʼihi na Onyenwe anyị emesola gị mmeso ọma.

8 Nʼihi na gị, o Onyenwe anyị , napụtara mkpụrụobi m site nʼọnwụ, anya m site na anya mmiri akwa, napụtakwa ụkwụ m site nʼịsọ ngọngọ,

9 ka m nwee ike jegharịa nʼihu Onyenwe anyị nʼime ala ebe ndị dị ndụ bi.

10 Ekwenyere m na Onyenwe anyị mgbe m kwuru sị, "Abụ m onye nọ nʼoke nsogbu,"

11 nʼime ịda mba m, ekwuru m sị, "Mmadụ niile bụ ndị ụgha."

12 Gịnị ka m ga-enyeghachi Onyenwe anyị nʼihi mmeso ọma niile o mesoro m?

13 Aga m eweli iko nke nzọpụta m elu kpọkuokwa aha Onyenwe anyị .

14 Nʼihu ndị ya niile ka m ga-anọ mezuo nkwa m kwere Onyenwe anyị .

15 Ọnwụ nke ndị nsọ ya dị oke ọnụahịa nʼanya Onyenwe anyị .

16 O Onyenwe anyị , nʼezie, abụ m ohu gị; abụ m ohu gị, nwa nwoke nke ohu gị nwanyị; ị zọpụtala m site na agbụ e kere m.

17 Aga m achụrụ gị aja ekele kpọkuokwa aha Onyenwe anyị .

18 Ọ bụkwa nʼihu ndị ya niile ka m ga-anọ kwụghachi Onyenwe anyị nkwa m kwere,

19 nʼime ogige ụlọ Onyenwe anyị , nʼetiti gị, O Jerusalem. Toonu Onyenwe anyị .