Chapter 140
1 O Onyenwe anyị , dọpụta m site nʼaka ndị na-eme ihe ọjọọ. Chebe m ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-eme ihe ike dị iche iche.
2 Ndị na-atụ atụmatụ ime ihe ọjọọ nʼobi ha na-akpali agha ụbọchị niile.
3 Ha na-eme ire ha ka ha dị nkọ dịka nke agwọ; elo ajụala dị nʼegbugbere ọnụ ha. Sela
4 Chebe m Onyenwe anyị , ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-emebi iwu; chebe m ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-eme ihe ike, ndị na-eche echiche ọdịda m.
5 Ndị mpako esielera m ọnya igbudu; ha agbasaala ụgbụ ha na udo ha, siekwara m ọnya dị iche iche nʼụzọ m na-aga. Sela
6 A sịrị m Onyenwe anyị , "Gị onwe gị bụ Chineke m." Nụrụ, O Onyenwe anyị , olu arịrịọ m maka amara.
7 Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị Onye nzọpụta m dị ike, ị na-ekpuchi isi m nʼụbọchị agha.
8 Ekwekwala ka ndị ajọ omume chọta ihe ha na-achọ, o Onyenwe anyị , ekwekwala ka nzube ha mezuo. Sela
9 Ndị niile gbara m gburugburu na-ebuli isi ha elu na nganga ka ndụ ọjọọ nke egbugbere ọnụ ha rikpuo ha.
10 Ka icheku ọkụ na-ere ere dakwasị ha; ka a tụba ha nʼime ọkụ na-ere ere, nʼime olulu apịtị jupụtara, nke ha na-enweghị ike isite nʼime ya pụta ọzọ.
11 Ekwela ka ndị na-ekwu okwu nkwulu guzosie ike nʼala, ka ihe ọjọọ chụda ndị na-eme ihe ike.
12 Amaara m na Onyenwe anyị ga-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị ogbenye na-emekwa ka ndị nọ na mkpa nweta ihe ruuru ha.
13 Nʼezie, ndị ezi omume ga-eto aha gị, ndị ziri ezi ga-ebikwa nʼihu gị.
