Abụ Ọma

Chapter 70

1 O Chineke, gbata ọsọ bịa zọpụta m, O Onyenwe anyị , bịa ngwangwa inyere m aka.

2 Ka ndị niile na-achọ ịnapụ m ndụ m, bụrụ ndị a ga-etinye nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara. Ka ndị ọ na-amasị ịhụ ịla nʼiyi m laghachi azụ nʼihere.

3 Ka ndị ahụ na-asị m, "Ehee! Ehee!" laghachi azụ nʼihi ihere ha.

4 Ma ka ndị niile na-achọ gị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime gị, ka ndị ahụ hụrụ nzọpụta gị nʼanya na-ekwu mgbe niile, " Onyenwe anyị dị ukwuu."

5 Ma mụ onwe m bụ ogbenye na onye nọ na mkpa; O Chineke, mee ngwangwa bịakwute m. Ị bụ onye inyeaka m na onye mgbapụta m; O Onyenwe anyị , anọla ọdụ ịbịa.