Chapter 24
1 Ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke Onyenwe anyị ; ụwa na ndị niile bi nʼime ya.
2 Ọ tọrọ ntọala ya nʼime oke osimiri niile, o mekwara ka o guzosie ike.
3 Onye bụ onye ahụ nwere ike irigo nʼelu ugwu Onyenwe anyị ? Onye nwere ike ịbata guzo nʼime ụlọnsọ ya?
4 Ọ bụ onye aka ya emeghị ihe ọjọọ, obi ya dịkwa ọcha, onye na-adịghị atụkwasị obi na chi arụsị, maọbụ ṅụọ iyi aghụghọ.
5 Ha ga-anata ngọzị site nʼaka Onyenwe anyị , natakwa mkpepụta site nʼaka Chineke Onye nzọpụta ha.
6 Otu a ka ọ ga-adịrị ọgbọ ndị ya, bụ ndị na-achọ ihu gị, Chineke nke Jekọb. Sela
7 Welitenụ isi unu, unu ọnụ ụzọ ama, meenụ ka isi unu bụrụ ihe e welitere, unu ọnụ ụzọ ama ochie, ka eze ebube nwee ike ịbata.
8 Onye bụ eze ebube a? Ọ bụ Onyenwe anyị , onye bụ dimkpa na dike. Ọ bụ Onyenwe anyị , onye bụ dike nʼagha.
9 Welitenụ isi unu, unu ọnụ ụzọ ama, buliekwanụ ha elu, unu ọnụ ụzọ ama ochie, ka Eze ebube nwee ike ịbatakwa.
10 Onye bụ eze ebube a? Ọ bụ Onyenwe anyị , Onye pụrụ ime ihe niile, ọ bụ ya bụ Eze ebube! Sela
