Chapter 6
1 O Onyenwe anyị , abarala m mba mgbe ị na-ewe iwe. Atala m ahụhụ nʼoge ọnụma gị.
2 Biko, meere m ebere Onyenwe anyị , nʼihi na adịghị m ike. Gwọọ m, nʼihi na ọkpụkpụ m niile nọ nʼihe mgbu.
3 Mkpụrụobi m nọ nʼọnọdụ ihe mgbu. Ruo ole mgbe, O Onyenwe anyị , ka ị ga-anọgide na-agba m nkịtị?
4 Onyenwe anyị , biko, bịa zọpụta m; nʼihi ịhụnanya gị na-enweghị ọgwụgwụ, napụta m.
5 Nʼetiti ndị nwụrụ anwụ ọ dịghị onye na-ekwupụta aha gị. O nwere onye na-eto gị site nʼala ili?
6 Ike agwụla m nʼihi ịsụ ude. Abalị niile, ana m eji ịkwa akwa mee ka ihe ndina m jupụta na mmiri, ana m eji anya mmiri dee ihe ndina m.
7 Anya m adịghị ahụzikwa ụzọ nke ọma nʼihi ihe mwute; ọ kaala nka nʼihi mmeso ndị iro m.
8 Sitenụ nʼebe m nọ wezuga onwe unu, unu ndị na-eme ajọ ihe, nʼihi na Onyenwe anyị anụla akwa m niile.
9 Onyenwe anyị anụla akwa m; ọ nụla arịrịọ nke m na-arịọ ya ka o meere m ebere. Ọ nabatala ekpere m.
10 Ka ndị iro m niile bụrụ ndị ihere ga-eme. Ha ga-ada mba, bụrụkwa ndị ga-eji ihere laghachi ebe ha si bịa.
