Abụ Ọma

Chapter 124

1 A sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị, ka Izrel kwuo,

2 a sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị, mgbe ndị mmadụ biliri imegide anyị,

3 mgbe iwe ha rere dịka ọkụ megide anyị, ha gaara eloda anyị na ndụ;

4 idee mmiri gaara iri anyị, oke mmiri gaara ebufu anyị,

5 ebili mmiri niile gaara ebufu anyị.

6 Ma otuto dịrị Onyenwe anyị , onye na-ekweghị ka ha jiri eze ha dọrie anyị.

7 Anyị agbanarịla ha dịka nwa nnụnụ si gbanarị ọnya osi ọnya chọrọ iji jide ya; ọnya ahụ agbajiela, anyị ewezugakwala onwe anyị, nwere onwe anyị.

8 Inyeaka anyị dị nʼaha Onyenwe anyị , onye kere eluigwe na ụwa.